NDI FILIPAI 2:1-13
NDI FILIPAI 2:1-13 Bible Nso (IGBOB)
Ya mere ọ buru na nkasi-obi ọ bula di nime Kraist, ọ buru na ngugu-obi ọ bula nke ihu-n'anya di, ọ buru na nnwekọ ọ bula nke Mọ Nsọ di, ọ buru na obi-ebere na ime-ebere ọ bula di, menu ka ọṅùm juputa, ka unu we tukwasi uche-unu n'otù ihe ahu, nwe kwa otù ihunanya ahu, nēnwekọ otù nkpuru-obi, nēnwe otù uche; unu emela ihe ọ bula n'uzọ ikpa-iche-iche ma-ọbu n'uzọ ichọ otuto efu, kama n'obi di ume-ala nāguritanu ibe-unu na ndi ka unu onwe-unu nma; unu nile n'otù n'otù elela ihe nke aka unu anya, kama unu nile n'otù n'otù le kwa ihe nke madu-ibe-unu anya. Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus: Onye, ọ bu ezie na Ọ diri n'udi nke Chineke na mbu, ma Ọ gughi ya n'ihe O gējidesi ike, bú ira ka Chineke, kama O mere Onwe-ya ihe-efu, n'inara udi nke orù, ewe me Ya n'oyiyi nke madu; ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n'oyiyi-Ya, O wedakwara Onwe-ya, we buru Onye nāṅa nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe. N'ihi nka Chineke welikwara Ya elu nke-uku, were kwa amara nye Ya aha ahu nke kariri aha nile ọ bula elu; ka ọ gābu n'aha Jisus ka ikperè nile we b͕ue n'ala, nke ihe nile di n'elu-igwe na ihe nile di n'elu uwa na ihe nile di n'okpuru ala, ka ire nile ọ bula we kwuputa kwa na Jisus Kraist bu Onye-nwe-ayi, ka ewe nye Chineke, bú Nna, otuto. Ya mere, ndi m'huru n'anya, dika unu ṅara nti mb͕e nile, ọ bughi nání mb͕e m'nọ n'etiti unu, kama ub͕u a mb͕e m'nānọghi, werenu egwu na ima-jijiji luputa kari nzọputa nke onwe-unu nke-uku; n'ihi na ọ bu Chineke Onye nālusi ọlu ike nime unu ichọ-achọ-unu na ilusi-ọlu-ike-unu, n'ihi na ọ di Ya ezi nma.
NDI FILIPAI 2:1-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ya mere, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọbụla dịrị anyị nʼihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere inyeaka ọbụla site nʼịhụnanya ya, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọbụla anyị na Mmụọ na-enwekọ, ọ bụrụ na unu nwere obi nro na ọmịiko, meenụ ka ọṅụ m zuo oke, site nʼinwe nkwekọta nʼihe ọbụla, site nʼịhụrịta onwe unu nʼanya, sitekwa nʼinwekọ otu mmụọ, na otu uche. Emela ihe ọbụla nʼihi naanị ọdịmma nke gị, maọbụ bie ndụ nʼụzọ ịdọtara onwe gị otuto efu. Kama bụrụ onye wedara onwe ya ala, onye na-ahụ ndị ọzọ dị ka ndị ka ya mma. Echela echiche banyere naanị ihe metụtara gị, kama, na-eleba anya nʼihe banyere ndị ọzọ. Na mmekọrịta unu na ibe unu, nweenụ ụdị uche ahụ nke dị nʼime Jisọs Kraịst: Onye ọ bụ ezie na o nwere ụdịdị Chineke site na mmalite ma ọ gụghị ụdịdị ya dị ka Chineke dị ka ihe ọ ga-ejidesi aka ike. Kama, ọ gụrụ onwe ya dị ka ihe efu, site na ịnara ụdịdị nke onye bụ ohu, onye nke a mụrụ dị ka mmadụ. Ebe ahụrụ ya ka ọ dịka mmadụ nʼoyiyi, o wedakwara onwe ya ala, site nʼirube isi ruo ọnwụ, bụ ọnwụ nke obe. Ọ bụ nʼihi nke a ka Chineke ji bulie ya elu nʼebe kachasị elu, nyekwa ya aha kachasị aha niile elu. Ka ọ ga-abụ mgbe ọbụla a kpọrọ aha Jisọs ka ikpere niile ọbụla gbuo nʼala, ihe niile dị nʼeluigwe, ndị niile bi nʼụwa, na ndị bi nʼokpuru ụwa. Ka ire niile ọbụla kwupụta na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, maka inye Chineke bụ Nna, otuto. Ya mere, ezi ndị enyi m, dị ka unu na-erube isi mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe m nọ, ma karịsịa ugbu a m na-anọghị unu nso, gaanụ nʼihu ịrụpụta nzọpụta unu site nʼịtụ egwu na ịma jijiji. Nʼihi na ọ bụ Chineke nʼonwe ya na-arụ ọrụ nʼime unu, inyere unu aka ịchọ ime ihe ọ chọrọ ka unu mee, na inyere unu aka ime ihe ahụ ọ chọrọ.