NDI FILIPAI 1:20-26
NDI FILIPAI 1:20-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ. Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru. Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ nʼanụ ahụ, nke a buuru m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ. Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma. Ma ọ pụtara ihe na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ nʼanụ ahụ. Ebe nke a doro m anya, amara m na mụ na unu niile ga-aga nʼihu ịnọ maka ọganihu na ọṅụ nke unu nʼime okwukwe. Ka mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, unu ga-enwebiga ọṅụ oke nʼime Kraịst Jisọs nʼihi m.
NDI FILIPAI 1:20-26 Bible Nso (IGBOB)
dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile. N'ihi na n'ebe m'nọ idi ndu bu Kraist, inwu anwu bu kwa urù. Ma ọ buru na idi ndu n'anu-aru bu òkèm, nka bu nkpuru nke ọlum: ihe m'gārọputa kwa amaghi m. Ma anọm n'ebe di nkpà n'etiti ihe abua ndia, ebe agu ila na inọ n'ebe Kraist nọ nāgum; n'ihi na ọ kachasi nma nke-uku: ma inọgide n'anu-aru dikariri nkpà n'ihi unu. Ebe m'tukwasiworo obi m n'ihe a, amataram na m'gānọgide, nọgide kwa n'etiti unu nile, ime ka unu ga n'iru ṅu kwa ọṅù nke okwukwe; ka inya-isi-unu we babiga ókè nime Kraist Jisus n'arum site n'ọbibia m'gābiakute unu ọzọ.