Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI FILIPAI 1:15-30

NDI FILIPAI 1:15-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ji ekworo na anya ụfụ na-ekwusa Kraịst, ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nʼọchịchọ obi ziri ezi. Ndị ahụ ji ọchịchọ obi ziri ezi na-eme nke a nʼịhụnanya ebe ha matara na e tinyere m ebe a nʼihi izisa oziọma. Ndị mbụ ahụ na-ekwusa Kraịst site nʼọchịchọ obi nke onwe ha, ọ bụghị site nʼezi obi, ebe ha na-eche na ha ga-akpalị nsogbu nye m nʼime mkpọrọ. Gịnịkwa ka ogbochiri? Otu ọ dị, maọbụ nʼụzọ aghụghọ maọbụ nʼeziokwu, ihe dị mkpa bụ nʼụzọ ọbụla a na-ekwusa oziọma Kraịst, nʼihi nke a ka m na-aṅụrị ọṅụ. E, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe niile. Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta. Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ. Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru. Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ nʼanụ ahụ, nke a buuru m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ. Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma. Ma ọ pụtara ihe na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ nʼanụ ahụ. Ebe nke a doro m anya, amara m na mụ na unu niile ga-aga nʼihu ịnọ maka ọganihu na ọṅụ nke unu nʼime okwukwe. Ka mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, unu ga-enwebiga ọṅụ oke nʼime Kraịst Jisọs nʼihi m. Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma, na-atụghị ụjọ ihe ndị na-emegide unu ga-eme. Iguzosi ike unu ga-agbara ha ezi ama banyere ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha. Ma nʼebe unu nọ, ọ ga-abụrụ unu nzọpụta pụtara ihe nke sikwa nʼebe Chineke nọ bịa. Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya. Unu nọ na-agabiga ụdị ibu agha ahụ unu hụrụ na m gabigara, nke unu na-anụkwa na m ka nọ nʼime ya ugbu a.

NDI FILIPAI 1:15-30 Bible Nso (IGBOB)

Ọ bu ezie na ufọdu nēkwusa Kraist-ayi ọbuná n'ihi ekworo na esem-okwu; ma ufọdu nēkwusa kwa Ya n'ihi na ọ di ha ezi nma: ndia nēme ya site n'ihunanya, ebe ha matara na edorom ka m'we gọpu ozi ọma: ma ndi ahu nēkwusa Kraist-ayi site n'ikpa-iche-iche, ọ bughi n'idi-ọcha-n'obi, ebe ha nēchè na ha gēwelirim nkpab͕u n'ab͕um. Gini kwa? ọ bu nání na n'uzọ ọ bula, ma ọ bu n'aghughọ ma-ọbu n'ezi-okwu, anēkwusa Kraist; nime nka ka m'nāṅuri kwa ọṅu, e, m'gāṅuri kwa ọṅu nime ya. N'ihi na amataram na nka gēme ka m'nwe nzọputa, site n'aririọ-unu na nnyezu nke Mọ nke Jisus Kraist, dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile. N'ihi na n'ebe m'nọ idi ndu bu Kraist, inwu anwu bu kwa urù. Ma ọ buru na idi ndu n'anu-aru bu òkèm, nka bu nkpuru nke ọlum: ihe m'gārọputa kwa amaghi m. Ma anọm n'ebe di nkpà n'etiti ihe abua ndia, ebe agu ila na inọ n'ebe Kraist nọ nāgum; n'ihi na ọ kachasi nma nke-uku: ma inọgide n'anu-aru dikariri nkpà n'ihi unu. Ebe m'tukwasiworo obi m n'ihe a, amataram na m'gānọgide, nọgide kwa n'etiti unu nile, ime ka unu ga n'iru ṅu kwa ọṅù nke okwukwe; ka inya-isi-unu we babiga ókè nime Kraist Jisus n'arum site n'ọbibia m'gābiakute unu ọzọ. Nání nēbinu obi dika ndi ala elu-igwe n'uzọ kwesiri ozi ọma nke Kraist: ka ọ gābu, ma m'bia hu unu ma-ọbu na anọghm, ka m'we nu ihe bayere ọnọdu-unu, na unu nēguzosi ike n'otù Mọ Nsọ, nēwere kwa otù nkpuru-obi lukọrọ okwukwe nke ozi ọma ahu ọ̀gù si-ike; ghara ikwe ka ndi nēmegide unu me ka unu tua ujọ n'ihe ọ bula: ebe nke ahu bu ihe nēme ka ila-n'iyì putara ha ìhè, ma ọ nēme ka nzọputa-unu puta ìhè, nka site-kwa-ra na Chineke; n'ihi na unu ka enyeworo ya n'amara n'ihi Kraist, ọ bughi nání ikwere na Ya, kama ihu kwa ahuhu n'ihi Ya: ebe unu nwere otù nb͕a ahu nke unu huru n'arum, ub͕u a ka unu nānu kwa na ọ di n'arum.