NDI FILIPAI 1:15-23
NDI FILIPAI 1:15-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ji ekworo na anya ụfụ na-ekwusa Kraịst, ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nʼọchịchọ obi ziri ezi. Ndị ahụ ji ọchịchọ obi ziri ezi na-eme nke a nʼịhụnanya ebe ha matara na e tinyere m ebe a nʼihi izisa oziọma. Ndị mbụ ahụ na-ekwusa Kraịst site nʼọchịchọ obi nke onwe ha, ọ bụghị site nʼezi obi, ebe ha na-eche na ha ga-akpalị nsogbu nye m nʼime mkpọrọ. Gịnịkwa ka ogbochiri? Otu ọ dị, maọbụ nʼụzọ aghụghọ maọbụ nʼeziokwu, ihe dị mkpa bụ nʼụzọ ọbụla a na-ekwusa oziọma Kraịst, nʼihi nke a ka m na-aṅụrị ọṅụ. E, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe niile. Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta. Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ. Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru. Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ nʼanụ ahụ, nke a buuru m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ. Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma.
NDI FILIPAI 1:15-23 Bible Nso (IGBOB)
Ọ bu ezie na ufọdu nēkwusa Kraist-ayi ọbuná n'ihi ekworo na esem-okwu; ma ufọdu nēkwusa kwa Ya n'ihi na ọ di ha ezi nma: ndia nēme ya site n'ihunanya, ebe ha matara na edorom ka m'we gọpu ozi ọma: ma ndi ahu nēkwusa Kraist-ayi site n'ikpa-iche-iche, ọ bughi n'idi-ọcha-n'obi, ebe ha nēchè na ha gēwelirim nkpab͕u n'ab͕um. Gini kwa? ọ bu nání na n'uzọ ọ bula, ma ọ bu n'aghughọ ma-ọbu n'ezi-okwu, anēkwusa Kraist; nime nka ka m'nāṅuri kwa ọṅu, e, m'gāṅuri kwa ọṅu nime ya. N'ihi na amataram na nka gēme ka m'nwe nzọputa, site n'aririọ-unu na nnyezu nke Mọ nke Jisus Kraist, dika olile-anya siri ike na ntukwasi-obi nkem si di, na n'ihe ọ bula ọ dighi ihere gēmem, kama na agēme kwa ka Kraist di uku n'arum ub͕u a, otú ọ di mb͕e nile, ma ọ bu site na ndu, ma-ọbu site n'ọnwu, nime nkwuwa-okwu nile. N'ihi na n'ebe m'nọ idi ndu bu Kraist, inwu anwu bu kwa urù. Ma ọ buru na idi ndu n'anu-aru bu òkèm, nka bu nkpuru nke ọlum: ihe m'gārọputa kwa amaghi m. Ma anọm n'ebe di nkpà n'etiti ihe abua ndia, ebe agu ila na inọ n'ebe Kraist nọ nāgum; n'ihi na ọ kachasi nma nke-uku