Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NDI FILIPAI 1:1-11

NDI FILIPAI 1:1-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Kraịst Jisọs, Na-edegara unu ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị nsọ niile nọ nʼụlọ nzukọ Kraịst Jisọs dị nʼobodo Filipai. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu. Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu. Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ. Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a. Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs. Ọ bụ ihe ziri ezi nʼebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu niile, nʼihi na unu dị m nʼobi. Ma m nọ nʼagbụ maọbụ na m na-echekwa oziọma, na mgbe m na-eme ka o guzosie ike, unu niile esorola m keta oke nʼamara ahụ. Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs. Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile. Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst. Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto.