ỌNU-ỌGUGU 9:15-23 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ỌNU-ỌGUGU 9:15-23 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị ahụ e guzobere ụlọ nzute ahụ bụ ụlọ ikwu nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, igwe ojii kpuchiri ya. Site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ igwe ojii ahụ dị nʼelu ụlọ nzute ahụ dịka ọkụ nʼile anya. Otu a ka ọ dịgidere mgbe niile. Igwe ojii kpuchigidere ya, ma nʼabalị ọ na-acha dị ka ọkụ. Mgbe ọ bụla igwe ojii ahụ si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie, ụmụ Izrel na-ebuli njem, ma mgbe ọbụla igwe ojii ahụ na-anọgide, ha na-anọgidekwa. Mgbe ONYENWE ANYị nyekwara iwu, ha na-akwụsị, maa ụlọ ikwu ha. Oge niile igwe ojii nọgidere nʼelu ụlọ nzute ahụ ka ụmụ Izrel na-anọgidekwa nʼụlọ ikwu ha. Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọọtee anya, ụmụ Izrel nʼonwe ha na-erube isi nʼiwu ONYENWE ANYị hapụ ịga nʼihu nʼije ha. Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị abalị ole na ole. Dịka iwu ONYENWE ANYị si dị, ha na-ama ụlọ ikwu ha, maọbụ bulie njem ha. Oge ụfọdụ, igwe ojii ahụ na-anọgide naanị site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Mgbe o si nʼelu ụlọ nzute ahụ bilie nʼụtụtụ, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha. Ọ bụrụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị, mgbe ọbụla igwe ojii ahụ biliri, ụmụ Izrel na-ebuli njem ha. Ọ bụrụ na igwe ojii ahụ anọdụ nʼelu ụlọ nzute ahụ abalị abụọ, maọbụ otu ọnwa, maọbụ otu afọ, ụmụ Izrel na-anọgide nʼụlọ ikwu ha. Ma ngwangwa igwe ojii ahụ biliri, ha onwe ha na-ebulikwa njem ha. Site nʼiwu ONYENWE ANYị na-enye, ha na-ama ụlọ ikwu ha, sitekwa nʼiwu ONYENWE ANYị nyere ha, ha na-ebili njem. Ha mere ihe niile ONYENWE ANYị kwuru nʼusoro dịka iwu o nyere ha site nʼọnụ Mosis si dị.
ỌNU-ỌGUGU 9:15-23 IGBOB (Bible Nso)
N'ubọchi eguzoro ebe-obibi ahu ọtọ igwe-oji ahu kpuchiri ebe-obibi, ọbuna ulo-ikwū nzute: ma n'anyasi ọ di n'elu ebe-obibi ahu dika ọku, n'ile ya anya, rue ututu. Otú a ka ọ di mb͕e dum: igwe-oji ahu nēkpuchi ya, ya na ọku n'abali, n'ile ya anya. Ma ọ di ka nrigo nke igwe-oji ahu site n'elu Ulo-ikwū si di, emesia umu Israel we bulie ije: ọ bu kwa n'ebe igwe-oji ahu bi, n'ebe ahu ka umu Israel nāma ulo-ikwū-ha. N'okwu-ọnu Jehova ka umu Israel nēbuli ije, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nāma ulo-ikwū-ha: ubọchi nile igwe-oji ahu nēbi n'elu ebe-obibi ahu ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū. Mb͕e igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu ọtutu ubọchi, umu Israel we debe ihe-ndebe nke Jehova, ha ebulighi kwa ije. Mb͕e ufọdu di mb͕e igwe-oji ahu nānọ ubọchi ole-na-ole n'elu ebe-obibi ahu; n'okwu-ọnu Jehova ka ha nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije. Mb͕e ufọdu di kwa mb͕e igwe-oji ahu nānọ site n'anyasi rue ututu; ma mb͕e igwe-oji ahu rigoro n'ututu, ha we bulie ije: ma n'ehihie ma n'abali, mb͕e igwe-oji ahu rigoro, ha we bulie ije. Ma asi na ọ bu ubọchi abua, ma-ọbu otù ọnwa, ma-ọbu otù arọ, ka igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu, ibi n'elu ya, umu Israel nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, ha ebulighi kwa ije: ma mb͕e emere ka ọ rigo, ha buliri ije. N'okwu-ọnu Jehova ha nāma ulo-ikwū-ha, ọ bu kwa n'okwu-ọnu Jehova ka ha nēbuli ije: ihe-ndebe nke Jehova ka ha debere, n'okwu-ọnu Jehova n'aka Moses.