ỌNU-ỌGUGU 8:7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ỌNU-ỌGUGU 8:7 IGBOB (Bible Nso)
Otú a ka i gēme ha, ime ka ha di ọcha: fesa ha miri nāsachapu nmehie, ka ha me kwa ka aguba gabiga n'anu-aru-ha nile, ka ha su kwa uwe-ha, me kwa onwe-ha ka ha di ọcha.
ỌNU-ỌGUGU 8:7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ime ka ha dị ọcha, lee ihe ị ga-eme. Fesa ha mmiri na-asachapụ mmehie. Hụkwa na ha kpụchapụrụ ajị niile dị ha nʼahụ, ma sachaa uwe ha. Si otu a mee ka ha bụrụ ndị dị ọcha.