Skip to content
Logò Ngwá Baịbụl

ỌNU-ỌGUGU 7:3 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ỌNU-ỌGUGU 7:3 IGBOB (Bible Nso)

ha we weta onyinye-ha iji biaru nso n'iru Jehova, ugbala isi nwere ihe-okpukpu, na ehi iri na abua; otù ugbala diri ndi-isi abua, otù ehi di-kwa-ra otù onye: ha we weta ha nso n'iru ebe-obibi ahu.

ỌNU-ỌGUGU 7:3 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ha wetara dịka onyinye ha nye ONYENWE ANYị ụgbọala isii ihe juputara nʼime ha, na ehi iri na abụọ. Ndị ndu abụọ ọbụla wetara otu ụgbọala, ma ha niile nʼotu na otu wetara otu ehi, otu ehi. Ha chere ihe ndị a niile nʼihu ụlọ nzute ahụ.