ỌNU-ỌGUGU 5:8 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ỌNU-ỌGUGU 5:8 IGBOB (Bible Nso)
Ma ọ buru na nwoke ahu enweghi onye-nb͕aputa nke ọ gēnyeghachi ihe ahu nke ikpe mara ya nime ya, ihe ahu ikpe mara ya nime ya nke anēnyeghachi Jehova, onye-nchu-àjà gēnwe ya; nāgughi ebulu nke nkpuchi-nmehie, nke agēji kpuchiri ya nmehie-ya.
ỌNU-ỌGUGU 5:8 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke ONYENWE ANYị, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere.