Mafee gaa na ọdịnaya

ỌNU-ỌGUGU 5:7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ỌNU-ỌGUGU 5:7 IGBOB (Bible Nso)

ha gēkwuputa kwa nmehie-ha nke ha meworo: ọ gēnyeghachi kwa ihe ikpe mara ya nime ya n'isi-ya, ọ bu kwa otù uzọ n'uzọ ise ya ka ọ gātukwasi ya, nye onye ahu ikpe mara ya bayere ya.

ỌNU-ỌGUGU 5:7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise.