ỌNU-ỌGUGU 3:39 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ỌNU-ỌGUGU 3:39 IGBOB (Bible Nso)
Ndi nile agukọtara agukọta nke ndi Livai, ndi Moses na Eron gukọtara n'okwu-ọnu Jehova, dika ab͕uru nile ha si di, ndikom nile, site n'onye ruru otù ọnwa we gaba n'iru, di orú nnù uzọ abua na nnù iri-na ise.
ỌNU-ỌGUGU 3:39 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ọnụọgụgụ ndị ikom Livayị niile Mosis na Erọn nwetara mgbe a gụrụ ha ọnụ nʼikwu nʼikwu dịka iwu ONYENWE ANYị nyere ha si dị, bụ iri puku abụọ na puku abụọ (22,000). Nke a bụ ọnụọgụgụ ndị ikom niile dị site nʼotu ọnwa gaa nʼihu.