Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ỌNU-ỌGUGU 19:1-22

ỌNU-ỌGUGU 19:1-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha, “Ndị a bụ ụkpụrụ dị nʼiwu ahụ ONYENWE ANYị nyere. Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara gị nwa nne ehi na-acha uhie uhie nke na-enweghị ntụpọ, na nke ụdọ yoku na-agabeghị nʼolu ya. Nye ya Elieza onye nchụaja, ka ọ kpụrụ ya pụọ nʼazụ ogige, ebe otu onye ga-egbu ya mgbe ọ nọ na-ele ya anya. Elieza bụ onye nchụaja ga-arụrụ ụfọdụ nʼime ọbara ya na mkpịsịaka ya, fesa ya na ncherita ihu ụlọ nzute ahụ ugboro asaa. Mgbe ahụ, onye ọzọ ga-akpọ nwa nne ehi ahụ ọkụ mgbe Elieza nọkwa na-ele ya anya. Ọ ga-akpọ akpụkpọ ya, anụ ya, ọbara na mgbịrị afọ ya ọkụ. Onye nchụaja ga-ewere osisi sida, na osisi hisọp, na ogho uhie, tụba ha nʼetiti ebe ahụ a kpọrọ nwa nne ehi ahụ ọkụ. Emesịa, onye nchụaja ahụ ga-asacha uwe niile o yi; sakwaa ahụ ya. Ọ ga-alọghachikwa azụ nʼime ogige ahụ ebe ọ ga-anọ dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. Onye ahụ kpọrọ nwa ehi ahụ ọkụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya. Ọ ga-anọkwa ọnọdụ onye na-adịghị ọcha ruo anyasị. “Mgbe ahụ, onye nke dị ọcha, ga-ekpokọta ntụ ozu nwa nne ehi ahụ, wụnye ya nʼebe dị ọcha nʼazụ ogige ahụ. Ebe ahụ ka nzukọ Izrel ga-edebe ya maka ikporo wụnye na mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha. Ọ bụ maka nsacha pụọ na mmehie. Ma onye ahụ ga-ekpokọta ntụ nsure ọkụ nwa nne ehi ahụ aghaghị ịsa uwe ya niile, sakwaa ahụ ya, nọkwaa dịka onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. Iwu a ga-adịgidere ndị Izrel na ndị ọbịa binyere ha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. “Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa. Ha aghaghị iji mmiri e ji asachapụ adịghị ọcha saa ahụ ha nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Mgbe ahụ, ha ga-adị ọcha. Ma ọ bụrụ na ha asaghị ahụ ha nʼụbọchị nke atọ nakwa nʼụbọchị nke asaa, ha ga-anọgide bụrụ ndị na-adịghị ọcha ọ bụladị mgbe ụbọchị asaa ahụ gafesịrị. Onye ọbụla metụrụ ozu mmadụ aka ma ọ saghị ahụ ya dịka usoro a si dị, o merụọla ebe nsọ ONYENWE ANYị. A ga-ewezuga onye dị otu a site nʼetiti ndị Izrel. Ebe ọ bụ na a wụsaghị ya mmiri nsacha ahụ; ọ ga-anọgide bụrụ onye na-adịghị ọcha. “Mgbe mmadụ nwụrụ nʼụlọ ikwu, ndị a ga-abụ iwu unu ga-eso. Ndị nọ nʼime ụlọ ikwu ahụ mgbe ọ nwụrụ na onye ọbụla banyere nʼụlọ ikwu ahụ, ga-abụ ndị na-adịghị ọcha ụbọchị asaa. Ihe ọbụla nke ghere oghe, nke na-enweghị ihe mkpuchi eriri e ji kechie elu ya, ga-abụ ihe na-adịghị ọcha. “Onye gara nʼọhịa metụ onye e gburu nʼagha aka, maọbụ onye nwụrụ nʼụzọ ọzọ dị iche, ma ọ bụkwanụ metụ ọkpụkpụ, maọbụ ili onye nwụrụ anwụ aka, ọ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ụbọchị asaa. “Ma banyere onye ahụ na-adịghị ọcha, kporo ntụ site nʼime aja mmehie ahụ a kpọrọ ọkụ, tinye ya nʼime ite, wụkwasị ya mmiri e si nʼiyi na-eru eru kute. Mgbe ahụ, nwoke nke nọ nʼọnọdụ ịdị ọcha ga-ewere ụfọdụ hisọp, denye ya na mmiri ahụ fesaa ya nʼime ụlọ ikwu ahụ, na ngwongwo niile e ji dozie ụlọ ahụ, na ndị mmadụ nọ nʼebe ahụ. Ọ ga-efesakwa ya nʼahụ onye ọbụla metụrụ ọkpụkpụ, maọbụ onye e gburu egbu, maọbụ onye nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ ili aka. Nwoke ahụ dị ọcha ga-efesakwa ndị ahụ rụrụ arụ nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. Nʼụbọchị nke asaa ka ọ ga-eme ka ha dị ọcha. Ndị ahụ a na-edo ọcha ga-asa uwe ha mmiri, saa ahụ ha, nʼuhuruchi ụbọchị ahụ ka ha ga-adị ọcha. Ma ọ bụrụ na ndị ahụ merụrụ onwe ha e doghị onwe ha ọcha, aghaghị iwepụ ha site nʼetiti ọgbakọ Izrel. Nʼihi na ha merụrụ ebe nsọ ONYENWE ANYị. E fesakwaghị ha mmiri nke ịdị ọcha nʼahụ, nke mere na ha adịghị ọcha. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide mgbe ebighị ebi. “Nwoke ahụ na-efesa mmiri ahụ e ji edo mmadụ ọcha, aghaghị ịsacha uwe ya niile. Onye ọbụla metụrụ mmiri nke ịdị ọcha ahụ aka, ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi. Ihe ọbụla kwa onye na-adịghị ọcha metụrụ aka, ga-aghọ ihe na-adịghị ọcha, onye ọbụla metụkwara ya aka ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo nʼuhuruchi.”

ỌNU-ỌGUGU 19:1-22 Bible Nso (IGBOB)

Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si, Nka bu ukpuru nke iwu ahu nke Jehova nyeworo n'iwu, si, Gwa umu Israel okwu, ka ha wetara gi nwa-ab͕ọghọ-ehi nācha uhie uhie nke zuru okè, nke ọlu nādighi n.aru-ya, nke ọ dighi mb͕e yoke rigokwasiri ya: unu gēnye ya Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ọ gēme ka ọ pua je n'azu ọmuma-ulo-ikwū, otù onye gēb͕u ya n'iru ya: Eleeza, bú onye-nchu-àjà, gēwere ufọdu nime ọbara-ya na nkpisi-aka-ya, fesa ufọdu nime ọbara-ya na ncherita-iru ulo-ikwū nzute ub͕ò asa: otù onye gēsure kwa nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu ọku n'anya-ya; akpukpọ-ya, na anu-ya, na ọbara-ya, tiyere nsi-ya, ka o gēsure ọku: onye-nchu-àjà gēwere kwa osisi cedar, na hyssop, na ogho uhie, tubà ya n'etiti nsure-ọku nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu. onye-nchu-àjà gāsu kwa uwe-ya, sa kwa anu-aru-ya na miri, emesia ọ gābata n'ọmuma-ulo-ikwū, onye-nchu-àjà gāru kwa árú rue anyasi. Onye ahu nke nēsure ya ọku gāsu kwa uwe-ya na miri, sa kwa anu-aru-ya na miri, ọ gāru kwa árú rue anyasi. Nwoke nke di ọcha gāchikọta ntu nke nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu, do ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū n'ebe di ọcha, ọ gābu-kwa-ra umu Israel ihe-ndebe ibu miri nke idi-na-nsọ: àjà-nmehie ka ọ bu. Onye ahu nke nāchikọta ntu nwa-ab͕ọghọ-ehi gāsu kwa uwe-ya, ru kwa árú rue anyasi: ọ gābu-kwa-ra umu Israel, buru kwa ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti ha, ukpuru ebighi-ebi. Onye nēmetu ozu nwuru anwu nke madu ọ bula aru gāru árú ubọchi asa: onye ahu gēwere ya wepu nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, n'ubọchi nke-asa ọ gādi kwa ọcha: ma ọ buru na o wepughi nmehie-ya n'ubọchi nke-atọ, ọ gaghi-adi kwa ọcha n'ubọchi nke-asa. Onye ọ bula nke nēmetu onye nwuru anwu aru, bú ozu madu nke nwuru anwu, ma o wepughi nmehie-ya, ebe obibi Jehova ka ọ nēmeru; agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'Israel n'ihi na awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka ọ gābu; ọrurú-ya nādikwasi ya rue ub͕u a. Nka bu iwu mb͕e madu nwuru n'ulo-ikwū: onye ọ bula nke nāba n.ulo-ikwū ahu, na onye ọ bula nke nọ n'ulo-ikwū ahu, gāru árú ubọchi asa. Ihe ọ bula nke ghere oghe, nke nēnweghi ihe-nkpuchi eriri eji kechi elu-ya, ihe ruru árú ka ọ bu. Onye ọ bula nke nēmetu onye eji mma-agha b͕u, ma-ọbu onye nwuru anwu, ma-ọbu ọkpukpu madu, ma-ọbu ílì, aru, n'ọhia sara iru, ọ gāru árú ubọchi asa. Ha gēwere kwa ufọdu nime ntu nsure-ọku àjà-nmehie ahu bayere onye ahu ruru árú, agētiye kwa miri nērù erù n'elu ya nime ihe: nwoke nke di ọcha gēwere kwa hyssop, sue ya na miri ahu, fesa ya n'ulo-ikwū ahu, na n'ihe-ya nile, na n'aru ndi nọ n'ebe ahu, na n'aru onye ahu nke metuworo ọkpukpu ahu, maọbu onye eb͕uru eb͕u ahu, ma-ọbu onye nwuru anwu ahu, maọbu ílì ahu, aru: onye ahu nke di ọcha gēfesa kwa onye ahu ruru árú n'ubọchi nke-atọ, na n'ubọchi nke-asa: ọ gēwepu kwa nmehie-ya n'ubọchi nke-asa; ọ gāsu kwa uwe-ya, sa kwa aru-ya na miri, di ọcha n'anyasi. Ma nwoke nke ruru árú, ma ọ dighi-ewepu nmehie-ya, agēbipu kwa nkpuru-obi ahu n'etiti nkpọkọta Israel, n'ihi na ọ bu nsọ Jehova ka ọ meruworo: awusaghi ya miri nke idi-na-nsọ ahu, onye ruru árú ka o bu. Ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru ebighi-ebi; onye nēfesa miri nke idi-na-nsọ ahu gāsu kwa uwe-ya; onye nēmetu miri nke idi-na-nsọ ahu aru gāru kwa árú rue anyasi. Ihe ọ bula onye ruru árú nēmetu aru gāru árú; madu nke nēmetu ya aru gāru árú rue anyasi.