ỌNU-ỌGUGU 18:26 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
ỌNU-ỌGUGU 18:26 IGBOB (Bible Nso)
I gāgwa kwa ndi Livai okwu, si ha, Mb͕e unu nānara n'aka umu Israel otù uzọ n'uzọ iri nke M'nyeworo unu site n'aka-ha, dika ihe-nketa-unu, unu gēsi kwa na ya bulie àjà-nbuli nke Jehova, bú otù uzọ n'uzọ iri nke si n'otù uzọ n'uzọ iri ahu puta.
ỌNU-ỌGUGU 18:26 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Gwa ndị Livayị okwu sị, ‘Mgbe unu si nʼaka ụmụ Izrel nata onyinye otu ụzọ nʼime ụzọ iri ahụ m nyere unu dịka ihe nketa, unu aghaghị isite nʼonyinye ahụ nye otu ụzọ nʼime ụzọ iri dịka onyinye nye ONYENWE ANYị.