Mafee gaa na ọdịnaya

ỌNU-ỌGUGU 16:3 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

ỌNU-ỌGUGU 16:3 IGBOB (Bible Nso)

ha we kpọkọta onwe-ha imegide Moses na imegide Eron, si ha, O zuworo unu, n'ihi na nzukọ Israel nile, ha nile n'otù n'otù, di nsọ, ọ bu kwa n'etiti ha ka Jehova nọ: ọ̀ bu kwa gini mere unu nēbuli onwe-unu kari nkpọkọta nke Jehova?

ỌNU-ỌGUGU 16:3 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ha kpọrọ ọgbakọ imegide Mosis na Erọn sị ha, “Omume unu agafeela oke! Ọgbakọ Izrel dị nsọ, onye ọbụla nʼime ha kwa. ONYENWE ANYị nọnyeere ha. Gịnị mere unu ji ebuli onwe unu elu karịa ọgbakọ ONYENWE ANYị?”