ỌNU-ỌGUGU 14:7-11
ỌNU-ỌGUGU 14:7-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha gwara nzukọ Izrel sị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala mara mma. Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ ONYENWE ANYị ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Unu enupukwala isi megide ONYENWE ANYị. Unu atụkwala egwu ndị bi nʼime ala ahụ, nʼihi na anyị ga-emeri ha. ONYENWE ANYị nọnyeere anyị. O wepụkwala aka nchebe ya nʼahụ ha. Unu atụla egwu ha.” Ma naanị nzaghachi ọgbakọ ndị Izrel nyere nʼihi okwu nkasiobi ndị a bụ iche uche otu ha ga-esi jiri nkume tugbuo Joshua na Kaleb. Nʼoge a, ebube ONYENWE ANYị pụtara ihe nʼụlọ nzute ahụ nye ndị Izrel niile. ONYENWE ANYị gwara Mosis okwu sị, “Ruo ole mgbe ka ndị a ga-anọgide na-eleda m anya? Ruo ole mgbe ka ha ga-anọ ju ikwenye na m, nʼagbanyeghị ọtụtụ ihe ịrịbama nke m mere nʼetiti ha.
ỌNU-ỌGUGU 14:7-11 Bible Nso (IGBOB)
ha we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Ala ahu nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala ahu di nma nke-uku nke-uku. Ọ buru na ihe ayi atọ Jehova utọ, Ọ gēme kwa ka ayi ba n'ala nka, Ọ gēnye kwa ayi ya; bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya. Nání, unu enupukwala isi n'aka Jehova, unu onwe-unu atu-kwa-la egwu ndi ala ahu; n'ihi na nri-ayi ka ha bu: ihe-nchegide-ha ewezugawo onwe-ya n'aru ha, ma Jehova nọyere ayi: unu atula egwu ha. Nzukọ Israel nile we si ka ewere nkume tub͕ue ha. Ewe me ka umu Israel nile hu ebube Jehova anya n'ulo-ikwū nzute. Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka ndi nka gēlelìm anya? ọ̀ bu kwa rue ole mb͕e ka ha nāgaghi-ekwe na Mu, n'ihi ihe-iriba-ama nile nke M'meworo n'etiti ha?