ỌNU-ỌGUGU 14:6-9
ỌNU-ỌGUGU 14:6-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mmadụ abụọ nʼime ndị nledo ahụ, Joshua nwa Nun na Kaleb nwa Jefune, dọwara uwe ha. Ha gwara nzukọ Izrel sị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala mara mma. Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ ONYENWE ANYị ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Unu enupukwala isi megide ONYENWE ANYị. Unu atụkwala egwu ndị bi nʼime ala ahụ, nʼihi na anyị ga-emeri ha. ONYENWE ANYị nọnyeere anyị. O wepụkwala aka nchebe ya nʼahụ ha. Unu atụla egwu ha.”
ỌNU-ỌGUGU 14:6-9 Bible Nso (IGBOB)
Joshua nwa Nun na Keleb nwa Jefune, bú ndi sitere na ndi nēledo ala ahu, we dọwa uwe-ha: ha we gwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, si, Ala ahu nke ayi gabigaworo nime ya iledo ya, ala ahu di nma nke-uku nke-uku. Ọ buru na ihe ayi atọ Jehova utọ, Ọ gēme kwa ka ayi ba n'ala nka, Ọ gēnye kwa ayi ya; bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya. Nání, unu enupukwala isi n'aka Jehova, unu onwe-unu atu-kwa-la egwu ndi ala ahu; n'ihi na nri-ayi ka ha bu: ihe-nchegide-ha ewezugawo onwe-ya n'aru ha, ma Jehova nọyere ayi: unu atula egwu ha.