NEHEMAIA 4:14 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NEHEMAIA 4:14 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe m lezichara ihe niile anya, eguzooro m ọtọ sị ndị ahụ a na-asọpụrụ, na ndị ọchịchị niile na ndị ọzọ nʼobodo ahụ, “Unu atụla ha egwu. Chetanụ na Onyenwe anyị, nke dị ukwuu na-eyikwa egwu, ma bukwaaranụ ezinaụlọ unu, ụmụ unu ndị ikom ndị inyom, ndị nwunye unu na ụlọ unu agha.”
Kesaa
NEHEMAIA 4 BIUNEHEMAIA 4:14 IGBOB (Bible Nso)
M'we hu, bilie, si ndi amara aha-ha, si kwa ndi nọchiri anya eze, si kwa ndi-ayi fọduru, Unu atula egwu ha: chetanu Onye-nwe-ayi, Nke di uku di kwa egwu, bu-kwa-ranu umu-nne-unu, na umu-unu ndikom, na umu-unu ndinyom, na ndinyom-unu, na ulo-unu, agha.
Kesaa
NEHEMAIA 4 IGBOB