NEHEMAIA 13:1-2 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NEHEMAIA 13:1-2 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị ahụ, a gụpụtara okwu Chineke na ntị ndị Izrel site nʼakwụkwọ iwu Mosis. Mgbe a na-agụpụta ya, a chọpụtara na o megidere iwu na onye Amọn, maọbụ onye Moab, ga-eso nʼofufe ụlọnsọ ukwu Chineke. Nʼihi na ha bụ ndị iro ụmụ Izrel. Ha enyeghị ha ihe oriri na ihe ọṅụṅụ kama ha zụrụ Belam ka ọ bụọ ụmụ Izrel ọnụ. (Ma Chineke anyị gbanwere ịbụ ọnụ ahụ mee ka ọ ghọọ ngọzị.)
Kesaa
NEHEMAIA 13 BIUNEHEMAIA 13:1-2 IGBOB (Bible Nso)
N'ubọchi ahu ka ha guru n'akwukwọ Moses na nti ndi Israel; ewe hu ihe edeworo nime ya, bú na onye Amon na onye Moab agaghi-abà na nkpọkọta ndi Chineke rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na ha ejighi achicha na miri bia n'iru umu Israel, kama ha gotara Belam imegide ha, ikọcha ha: ma Chineke-ayi b͕anwere nkọcha ahu ka ọ ghọ ngọzi.
Kesaa
NEHEMAIA 13 IGBOB