Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

NEHEMAIA 12:27 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

NEHEMAIA 12:27 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Mgbe a na-edo mgbidi Jerusalem ọhụrụ ahụ nsọ, e sitere nʼobodo niile ndị Livayị bi kpọọ ha ka ha bịa nye aka iji ọṅụ mee mmemme ido nsọ ahụ. Ha bịakwara jiri abụ ekele na ihe egwu dị iche iche dịka ụbọ akwara, ịgba na une kelee Chineke.

NEHEMAIA 12:27 IGBOB (Bible Nso)

Ma n'ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke ha chọputara ndi Livai n'ebe-ha nile, ime ka ha biarue Jerusalem, ime ememe nke ira mb͕idi Jerusalem nye Chineke, ọbuná n'iṅuri-ọṅu, na n'ikele-ekele, na n'ibù-abù, n'ájà na une na n'ubọ-akwara.