NEHUM 2:3 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
NEHUM 2:3 IGBOB (Bible Nso)
Ọta ndi-dike-ya bu ihe esijiri ọbara-ọbara, ndi-dìnkpà-ya yiri uwe nācha uhie uhie: ígwè nēb͕upu eb͕upu ka ub͕ọ-ala-ya nwere n'ubọchi ndozi-ya, emewo ka osisi fir nile me nkpatu nke-uku.
NEHUM 2:3 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọta ndị agha ya na-acha ọbara ọbara, ndị bụ dike nʼagha yikwa uwe na-acha uhie uhie. Igwe e ji wuo ụgbọ agha na-egbu amụma nʼụbọchị ahụ ha na-ejikere agha, otu a kwa, ha na-efegharịkwa ùbe ha eji osisi fịa mee.