NEHUM 1:2-3
NEHUM 1:2-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ. ONYENWE ANYị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi. ONYENWE ANYị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya, oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya. ONYENWE ANYị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu, ONYENWE ANYị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ. Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe, igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya.
NEHUM 1:2-3 Bible Nso (IGBOB)
Chineke ekworo, Nke nābọ̀ kwa ọ́bọ̀, ka Jehova bu; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye-nwe ọnuma; onye-ọ́bọ̀ ka Jehova bu n'aru ndi nēmegide Ya, onye nēdebere ndi-iro-Ya iwe ka Ọ bu. Jehova adighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ike, ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmagh: Jehova, n'oké ikuku na n'oké ifufe ka uzọ-Ya di, igwe-oji bu kwa ájá ukwu-Ya abua.