MAK 9:19-24 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MAK 9:19-24 IGBOB (Bible Nso)
O we za ha, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ? rùe ole mb͕e ka M'gānagide unu? unu kutaram ya. Ha we kuru ya biakute Ya: mb͕e ọ huru Ya, ngwa ngwa mọ ahu we sesie ya ike; o we da n'ala, nāturu, nāsu kwa ufufu. O we jua nna-ya, si, Ò ruru ole mb͕e ihe a meworo ya? O we si, Site na nwata. Ọtutu mb͕e ọ tubà-kwa-ra ya n'ọku na nime miri, ila ya n'iyì: ma ọ buru na I puru ime ihe, nwe ọmiko n'aru ayi, nyere ayi aka. Ma Jisus siri ya, Ọ buru na I puru! Onye nke kwere puru ime ihe nile. Ngwa ngwa nna nwatakiri ahu tiri nkpu, si, Ekwem; nyere ekweghi-ekwem aka.
MAK 9:19-24 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ zaghachiri ha sị, “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anagide unu? Kpọtaranụ m ya!” Ya mere, ha kpọtaara ya nwata ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ ya, ngwangwa, o nugharịrị nwata ahụ nke ukwuu, ọ daa nʼala na-atụrụ onwe ya nʼala, na-agbọkwa ụfụfụ nʼọnụ ya. Jisọs jụrụ nna nwata ahụ sị, “Olee mgbe ihe a bidoro?” Ọ zara sị, “Site na mgbe ọ bụ nwata nta. Ọ na-eme ya ka ọ daba nʼọkụ, maọbụ na mmiri, ka ọ laa ya nʼiyi. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.” Jisọs sịrị ya, “ ‘Ọ bụrụ na i nwere ike’? Ihe niile pụrụ ime nʼebe onye kwere ekwe nọ.” Ngwangwa, nna nwata ahụ tiri mkpu sị, “Ekweere m, biko nyere ekweghị ekwe m aka!”