MAK 6:17-29 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MAK 6:17-29 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na Herọd nʼonwe ya nyererị iwu ka e jide Jọn kee ya agbụ tụba ya nʼụlọ mkpọrọ. O mere nke a nʼihi Herodịas bụrịị nwunye Filip nwanne ya, onye ọ kpọrọ dịka nwunye ya. Nʼihi na Jọn gwara Herọd sị, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ nwunye nwanne gị nwoke.” Nʼihi ya Herodịas bu iro nʼobi megide Jọn na-achọkwa ụzọ igbu ya, mana ọ pụghị ime nke a, nʼihi na Herọd na-atụ egwu ma na-echekwa Jọn, ebe ọ maara na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ. Mgbe ọ nụrụ okwu ya, o nweghị udo nʼobi ma ige ya ntị na-amasị ya. Nʼikpeazụ, ohere bịara mgbe Herọd kpọrọ oriri nʼụbọchị ncheta ọmụmụ ya nye ndị ọkwa ha dị elu nʼokpuru ọchịchị ya, ndịisi ndị ọchịagha na ndị bụ ndị ndu nʼobodo Galili. Mgbe ada Herodịas bịara tee egwu, obi tọrọ Herọd na ndị niile ọ kpọrọ oriri ụtọ. Eze gwara nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ aga m enyekwa gị ya.” O kwere ya nkwa ṅụọkwa iyi sị, “Ihe ọbụla ị rịọrọ m aga m enye gị, ọ bụladị ọkara alaeze m.” Ọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, “Gịnị ka m ga-arịọ?” Ọ zara ya sị, “Isi Jọn omee baptizim.” Ngwangwa, ọ bịakwutere eze rịọ ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nʼime efere, isi Jọn omee baptizim.” O wutere eze nke ukwuu, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ, na nʼihi ndị ọ kpọrọ oriri, ọ chọghị ịjụ inye ya ihe ọ rịọrọ ya. Ngwangwa o zipụrụ onye agha na-eche nche nye ya iwu ka ọ gaa bute isi Jọn. Ọ gara, bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ, tinye isi ahụ nʼime efere butere nwaagbọghọ ahụ onye nara ya bunye nne ya. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha bịara buru ozu ya gaa lie.
MAK 6:17-29 IGBOB (Bible Nso)
N'ihi na Herod onwe-ya zipururi jide Jọn, we ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya: n'ihi na ọ luru ya na nwunye. N'ihi na Jọn nāsi Herod, O zighi gi ezi n'iwu inwe nwunye nwa-nna-gi. Ma Herodias dobere ya iwe n'obi, ọ chọ-kwa-ra ib͕u ya; ma ọ pughi; n'ihi na Herod nātu egwu Jọn, ebe ọ matara na ọ bu nwoke nke bu onye ezi omume na onye di nsọ, ọ nēdebe kwa ya nke-ọma. Ọzọ, mb͕e ọ nuru okwu-ya, ọ nēchè uche nke-uku; o were kwa obi-utọ nānu ya. Ma mb͕e ubọchi di oghere ruru, mb͕e Herod siri nri-anyasi na ncheta-ọmumu-ya nye ndi-amadi-ya, na ndi-ọchi-agha, na ndi-isi nke Galili; mb͕e nwa-nwanyi Herodias onwe-ya bata-kwa-ra, te egwú, o we tọ ha utọ, bú Herod na ndi ya na ha nānọdu na nri; eze we si nwa-ab͕ọghọ ntà ahu, Riọm ihe ọ bula i nāchọ, na m'gēnye gi ya. O we ṅuara ya iyi, si, Ihe ọ bula i gāriọm, m'gēnye gi ya, rue nkera nke ala-ezem. O we pua, si nne-ya, Gini ka m'gāriọrọ onwem? O we si, Isi Jọn onye nēme baptism. O were ọsọ bata ngwa ngwa n'ebe eze ahu nọ, we riọ, si, Anamachọ ka i nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa ub͕u a. O we wuta eze ahu n'obi nke-uku; ma n'ihi iṅu-iyi-ya nile, na n'ihi ndi nọduru na nri, ọ chọghi iju ya. Ngwa ngwa eze we zipu onye-agha nēche nche, nye ya iwu ibaute isi-ya: o we je we bipu isi-ya n'ulo-nkpọrọ, we bute isi-ya n'ọkwa, nye ya nwa-ab͕ọghọ ntà ahu; nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we nye ya nne-ya. Mb͕e ndi nēso uzọ-ya nuru ya, ha we bia būru ozu-ya, tọb͕ọ ya n'ílì.