Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MAK 1:4-7 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MAK 1:4-7 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Jọn omee baptizim pụtara na-eme baptizim nʼọzara, ma na-ekwusa baptizim nke nchegharị maka mgbaghara mmehie. Ndị mmadụ si nʼakụkụ Judịa niile na ndị niile bi na Jerusalem pụrụ jekwuru ya. Ka ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. Uwe Jọn yi nʼahụ ya bụ nke e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike e ji akpụkpọ anụ mee nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. O kwusara sị: “Onye dị ike karịa m na-abịa nʼazụ m. Onye m na-erughị ihudata ala tọpụ eriri akpụkpọụkwụ ya.

MAK 1:4-7 IGBOB (Bible Nso)

Jọn putara ìhè, onye nēme baptism n'ọhia, nēkwusa kwa baptism nchèghari inwe nb͕aghara nmehie. Ala Judia nile na ndi Jerusalem nile nāpukuru ya; ọ neme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha. Jọn nēyi aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya, nēri kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia. Ọ nēkwusa kwa, si, Onye kam ike nābia n'azum, Onye m'nērughi iruru ala itọpu eriri akpukpọ-ukwu-Ya abua.