MAIKA 7:2-4
MAIKA 7:2-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ndị ezi omume agwụla nʼụwa, ọ dịkwaghị otu onye na-eme ihe ziri ezi fọdụrụ. Ha niile na-echere oghere ịkwafu ọbara, ha ji ụgbụ na-achụta nta, onye ọbụla na-achụ ụmụnne ya. Ọrụ nke aka ha abụọ na-arụpụta nke ọma bụ ajọ omume. Onyeisi na-ana onyinye, onye ọkaikpe na-eri ngarị, ndị dị ike na-atụpụta ihe masịrị ha, si otu a na-akpagbu eziokwu. Onye nke kachasị ibe ya ịdị mma nʼime ha dịka uke. Onye nke na-eme ihe ziri ezi nʼime ha jọrọ njọ karịa ogige ogwu. Ma ugbu a, ụbọchị Chineke na-eleta gị abịala, ụbọchị ahụ ndị nche gị na-akụ ekwe ịdọ aka na ntị. Ugbu a bụ oge ihe ịgba gharịị nye ha.
MAIKA 7:2-4 Bible Nso (IGBOB)
Onye-ebere alawo n'iyì pua n'uwa, ọ dighi kwa onye ziri ezi n'etiti madu: ha nile nēche anwu ọbara; ha ji ub͕u achu ntá, onye ọ bula nwa-nne-ya. Ọ bu n'elu ihe ọjọ ka ọbu-aka-ha abua di ime ya nke-ọma; onye-isi nāriọ, onye-ikpe ewe jikere n'ihi ugwọ; onye uku kwa, onye nēkwu ihe-ila-n'iyì nke nkpuru-obi-ya ka ọ bu: ha we tukọta ya dika udọ̀. Onye nke ha nke kachasi nma di ka uke: onye ziri ezi jọrọ njọ kari ogige ogwu: ubọchi ndi-nche-gi, bú nleta-gi, abiawo; ub͕u a ka mb͕e ib͕a ha ghari gādi.