MATIU 9:9-13 - Compare All Versions
MATIU 9:9-13 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs si nʼebe ahụ na-aga, ọ hụrụ otu nwoke a na-akpọ Matiu ka ọ nọdụrụ ala nʼụlọ ịnakọta ụtụ. Ọ sịrị ya, “Soro m.” Na-atụfughị oge, ọ hapụrụ ihe niile soro ya. Dị ka ọ nọdụrụ ala iri nri uhuruchi nʼụlọ Matiu, ọtụtụ ndị ọna ụtụ na ndị mmehie sooro ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ na-eri nri. Mgbe ndị Farisii hụrụ nke a, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere onye ozizi unu ji eso ndị ọna ụtụ na ndị mmehie na-eri nri?” Mgbe ọ nụrụ nke a, Jisọs sịrị, “Mkpa dibịa adịghị akpa ndị ahụ dị ike, kama ọ bụ ndị ahụ na-esighị ike ka mkpa dibịa na-akpa. Ma gaanụ mụta ihe okwu a pụtara, ‘Ana m achọ ebere, ọ bụghị aja.’ Nʼihi na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie.”
MATIU 9:9-13 IGBOB (Bible Nso)
Mb͕e Jisus nēsi n'ebe ahu nāga, Ọ huru otù nwoke, anākpọ Matiu, ka ọ nọduru n'ulo-ùtú: Ọ si ya, Som. O we bilie, so Ya. O rue, mb͕e Ọ nọduru na nri n'ulo-ya, le, ọtutu ndi-ọna-utu na ndi-nmehie biara so Jisus na ndi nēso uzọ-Ya nọdu na nri. Mb͕e ndi-Farisi huru ya, ha we si ndi nēso uzọ-Ya, N'ìhi gini ka Onye-ozizí-unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia eri ihe? Ma mb͕e Ọ nuru ya, Ọ si, Nkpà dibia akpaghi ndi di ike, kama ọ nākpà ndi aru nādighi nma. Ma ganu muta ihe okwu a bu, Anamachọ ebere, ọ bughi àjà: n'ihi na abiaghm ikpọ ndi ezi omume, kama ọ bu ndi-nmehie.