Skip to content
Logò Ngwá Baịbụl

MATIU 6:2-3 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MATIU 6:2-3 IGBOB (Bible Nso)

Ya mere, mb͕e ọ bula i nālu ọlu ebere, afùla opì n'iru gi, ọbuná dika ndi-iru-abua nēme n'ulo-nzukọ-unu na n'uzọ-unu, ka ha we nara otuto n'aka madu. N'ezie asim unu, Ha nēnwezu ugwọ-ọlu-ha. Ma mb͕e i nālu ọlu ebere, ka aka-ekpe-gi ghara ima ihe aka-nri-gi nēme

Kekọrịta
MATIU 6 IGBOB

MATIU 6:2-3 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị nọ na mkpa onyinye, nʼihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme nʼụlọ nzukọ na nʼokporoụzọ, ka ndị mmadụ too ha. Nʼezie, ana m agwa unu, ha anatala ụgwọ ọrụ ha nʼizuoke. Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, meenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime.

Kekọrịta
MATIU 6 BIU