MATIU 5:7-12 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 5:7-12 IGBOB (Bible Nso)
Ngọzi nādiri ndi-ebere: n'ihi na ndi ahu ka agēmere ebere. Ngọzi nādiri ndi di ọcha n'obi: n'ihi na ndi ahu gāhu Chineke. Ngọzi nādiri ndi nēme ka madu na ibe-ha di n'udo: n'ihi na ndi ahu ka agākpọ umu Chineke. Ngọzi nādiri ndi esob͕uworo n'ihi ezi omume: n'ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi ahu. Ngọzi nādiri unu mb͕e ọ bula ha nāta unu uta, nēsob͕u kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n'okwu-ugha, n'ihim. Ṅurianu ọṅu, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n'ihi na ugwọ-ọlu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú a ka ha sob͕uru ndi-amuma ndi buru unu uzọ.
MATIU 5:7-12 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere. Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya. Ngọzị na-adịrị ndị na-eme ka udo dị nʼetiti mmadụ na ibe ya, nʼihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke. Ngọzị na-adịrị ndị a na-emegbu nʼihi ezi omume, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. “Ngọzị na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu, na-emegbu unu, ma na-ekwukwa okwu ọjọọ na ụgha niile dị iche iche megide unu nʼihi m. Ṅụrịanụ ọnụ, nwekwanụ obi ụtọ, nʼihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu nʼeluigwe. Nʼihi na nʼụzọ dị otu a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.