Mafee gaa na ọdịnaya

MATIU 5:39-40 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MATIU 5:39-40 IGBOB (Bible Nso)

ma Mu onwem si unu, Eguzogidela onye bu ajọ onye: kama onye ọ bula nāku gi ura na ǹtì aka-nri, tughari-kwa-ra ya ǹtì ọzọ. Ma ọ buru na onye ọ bula nāchọ ka gi na ya je ikpé, ka o we nara gi uwe-ime-gi, rapu-kwa-ra ya oké uwe-gi.

MATIU 5 IGBOB

MATIU 5:39-40 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Ma ana m asị unu eguzogidela onye bụ ajọ onye. Kama ọ bụrụ na mmadụ amaa gị ụra na ntị aka nri, tụgharịara ya ntị nke ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ agbaa gị akwụkwọ nʼụlọikpe, ka ọ nara gị uwe ime gị, nyekwa ya uwe nke elu gị.

MATIU 5 BIU