MATIU 5:30 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 5:30 IGBOB (Bible Nso)
Ma ọ buru na aka-nri-gi eme gi ka i ma n'ọnya, bipu ya, tupu kwa ya n'aru-gi: n'ihi na ọ bara gi urù ka otù nime ihe di gi n'aru la n'iyì, ka aru-gi dum ghara kwa ije n'ọku ala-mọ.
Kesaa
MATIU 5 IGBOBMATIU 5:30 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ.
Kesaa
MATIU 5 BIU