MATIU 5:3-8
MATIU 5:3-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi. Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa. Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju. Ngọzị na-adịrị ndị na-eme obi ebere, nʼihi na ha ka a ga-emere ebere. Ngọzị na-adịrị ndị dị ọcha nʼobi, nʼihi na ha ga-ahụ Chineke anya.
MATIU 5:3-8 Bible Nso (IGBOB)
Ngọzi nādiri ndi bu ob͕eye nime mọ-ha: n'ihi na ala-eze nke elu-igwe bu nke ndi ahu. Ngọzi nādiri ndi nēru újú: n'ihi na ndi ahu ka agākasì obi. Ngọzi nādiri ndi di nwayọ n'obi: n'ihi na ndi ahu gēketa uwa. Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n'ihi na ndi ahu ka afọ gēju. Ngọzi nādiri ndi-ebere: n'ihi na ndi ahu ka agēmere ebere. Ngọzi nādiri ndi di ọcha n'obi: n'ihi na ndi ahu gāhu Chineke.