MATIU 5:1-6
MATIU 5:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Jisọs hụrụ igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu. Mgbe ọ nọdụrụ ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya, o bido ikuziri ha ihe. Ọ sịrị: “Ngọzị na-adịrị ndị bụ ogbenye nʼime mmụọ, nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Ngọzị na-adịrị ndị na-eru ụjụ, nʼihi na a ga-akasị ha obi. Ngọzị na-adịrị ndị dị nwayọọ nʼobi, nʼihi na ha ga-eketa ụwa. Ngọzị na-adịrị ndị agụụ ezi omume na-agụ, nʼihi na ndị ahụ ka afọ ga-eju.
MATIU 5:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e Ọ huru ìgwè madu ahu, Ọ rigoro n'ugwu ahu: mb͕e Ọ nọduru ala, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya: O we saghe ọnu-Ya, zí ha ihe, si, Ngọzi nādiri ndi bu ob͕eye nime mọ-ha: n'ihi na ala-eze nke elu-igwe bu nke ndi ahu. Ngọzi nādiri ndi nēru újú: n'ihi na ndi ahu ka agākasì obi. Ngọzi nādiri ndi di nwayọ n'obi: n'ihi na ndi ahu gēketa uwa. Ngọzi nādiri ndi agu ezi omume nāgu, ndi akpiri nākpọ kwa nku na ya: n'ihi na ndi ahu ka afọ gēju.