MATIU 4:20-22
MATIU 4:20-22 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya. Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa Zebedi na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha Zebedi nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha, ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya.
Kesaa
Gụọ MATIU 4MATIU 4:20-22 Bible Nso (IGBOB)
Ngwa ngwa ha we rapu ihe nile ha ji eb͕u azù, so Ya. O we si n'ebe ahu ga, hu umu-nne abua ọzọ, Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne-ya, nime ub͕ọ-ha, ha na nna-ha Zebedi, nēkezi ihe ha ji eb͕u azù; O we kpọ ha. Ngwa ngwa ha we rapu ub͕ọ ahu na nna-ha, so Ya.
Kesaa
Gụọ MATIU 4