MATIU 4:2-4
MATIU 4:2-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara Chineke, gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.” Ma Jisọs zara, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ Chineke pụta.’”
Kesaa
Gụọ MATIU 4MATIU 4:2-4 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e O busiri ọnu ọgu ubọchi abua ehihie na abali, emesia agu guru Ya. Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha. Ma Ọ zara, si, Edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu okwu nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Chineke puta.
Kesaa
Gụọ MATIU 4