MATIU 3:7-9
MATIU 3:7-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma mgbe ọhụrụ ọtụtụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha na-abịa ka e mee ha baptizim, ọ sịrị ha, “Unu ụmụ ajụala, onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa? Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu echekwala na unu pụrụ ị sị nʼime onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna,’ nʼihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ.
Kesaa
Gụọ MATIU 3MATIU 3:7-9 Bible Nso (IGBOB)
Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia? Ya mere, mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu; unu echè-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia.
Kesaa
Gụọ MATIU 3