MATIU 3:5-12
MATIU 3:5-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼoge ahụ, ndị mmadụ sitere Jerusalem, na Judịa niile, nʼala niile dị Jọdan gburugburu, na-apụkwuru ya. Mgbe ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan. Ma mgbe ọhụrụ ọtụtụ ndị Farisii na ndị Sadusii ka ha na-abịa ka e mee ha baptizim, ọ sịrị ha, “Unu ụmụ ajụala, onye dọrọ unu aka na ntị sị unu gbanarị ọnụma nke na-abịa? Mịanụ mkpụrụ na-egosipụta nchegharị unu. Unu echekwala na unu pụrụ ị sị nʼime onwe unu, ‘Anyị nwere Ebraham dịka nna,’ nʼihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Ebraham ụmụ. Ma ugbu a atụkwasịla anyụike na mgbọrọgwụ osisi niile. Osisi ọbụla nke na-adịghị amị ezi mkpụrụ ka a ga-egbutu, tụba ya nʼime ọkụ. “Mụ onwe m ji mmiri eme unu baptizim nʼihi nchegharị, ma onye dị ike karịa m na-abịa. Onye m na-erughị ịchịta akpụkpọụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ were mee unu baptizim. Ihe ịfụcha ọka ya dị ya nʼaka, ọ ga-azacha ebe ịzọcha ọka ya nke ọma, chịkọta mkpụrụ ọka wiiti tinye ha nʼọba, ma jiri ọkụ a na-apụghị imenyụ emenyụ rechapụ igbugbo ọka.”
MATIU 3:5-12 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu Jerusalem, na Judia nile, na ala nile di Jọdan buruburu, nāpukuru ya; ọ nēme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha. Ma mb͕e ọ huru ọtutu madu nime ndi-Farisi na ndi-Sadusi ka ha nābia baptism-ya, ọ siri ha, Unu umu nke aju-ala, ònye gosiri unu ka unu b͕anari iwe gaje ibia? Ya mere, mianu nkpuru kwesiri nchèghari-unu; unu echè-kwa-la ikwu nime onwe-unu, si, Ayi nwere Abraham na nna: n'ihi na asim unu, na Chineke puru ime ka umu tolitere Abraham site na nkume ndia. Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile: ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku. Mu onwem nēji miri me unu baptism n'ezie ka unu we chègharia: ma Onye nke nābia n'azum kam ike, Onye m'nērughi ichi akpukpọ-ukwu-Ya: Onye ahu gēji Mọ Nsọ na ọku me unu baptism: Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, Ọ gāfuchapu kwa ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, Ọ gēkpokọta kwa ọka-Ya n'ọba-Ya, ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.