MATIU 3:4-6
MATIU 3:4-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Jọn yi uwe e ji ajị ịnyịnya kamel mee. O kekwara ihe okike ukwu nke akpụkpọ anụ nʼukwu ya. Nri ya bụ igurube na mmanụ aṅụ. Nʼoge ahụ, ndị mmadụ sitere Jerusalem, na Judịa niile, nʼala niile dị Jọdan gburugburu, na-apụkwuru ya. Mgbe ha na-ekwupụta mmehie ha, o mere ha baptizim nʼosimiri Jọdan.
Kesaa
Gụọ MATIU 3MATIU 3:4-6 Bible Nso (IGBOB)
Ma Jọn onwe-ya nwere uwe-oyiyi-ya nke aji camel, nēke kwa akpukpọ-ọkiké n'úkwù-ya; nri-ya bu kwa igurube na manu-aṅu nke ọhia. Mb͕e ahu Jerusalem, na Judia nile, na ala nile di Jọdan buruburu, nāpukuru ya; ọ nēme kwa ha baptism n'osimiri Jọdan, ha nēkwuputa nmehie nile ha.
Kesaa
Gụọ MATIU 3