MATIU 3:2-3 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 3:2-3 IGBOB (Bible Nso)
si, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso. N'ihi na nwoke a bu onye ekwuru okwu bayere ya site n'ọnu Aisaia onye-amuma, si, Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.
MATIU 3:2-3 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.” Nʼihi na nwoke a bụ onye e kwuru okwu banyere ya site nʼọnụ onye amụma Aịzaya sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ”