Mafee gaa na ọdịnaya

MATIU 3:1-3 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MATIU 3:1-3 IGBOB (Bible Nso)

Ma na mb͕e ahu Jọn Baptist biara, nēkwusa n'ọhia nke Judia, si, Chègharianu; n'ihi na ala-eze elu-igwe di nso. N'ihi na nwoke a bu onye ekwuru okwu bayere ya site n'ọnu Aisaia onye-amuma, si, Olu otù onye nēti nkpu n'ọhia, si, Dozienu uzọ Onye-nwe-ayi, Menu okporo-uzọ-Ya ka ha guzozie.

MATIU 3 IGBOB

MATIU 3:1-3 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Nʼoge ahụ, Jọn omee baptizim bịara na-ezisa ozi nʼọzara Judịa. Isi okwu ya bụ, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.” Nʼihi na nwoke a bụ onye e kwuru okwu banyere ya site nʼọnụ onye amụma Aịzaya sị, “Otu onye na-eti mkpu nʼọzara, na-asị, ‘Dozienụ ụzọ maka Onyenwe anyị, meenụ ka okporoụzọ ya guzozie.’ ”

MATIU 3 BIU