MATIU 27:50-54
MATIU 27:50-54 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọzọkwa, Jisọs jiri oke olu tie mkpu, kubie ume. Nʼotu ntabi anya ahụ kwa, akwa mgbochi nke ụlọnsọ ahụ gbawara site nʼelu ruo nʼala. Ala makwara jijiji. Nkume tiwasịkwara. Ala ili meghere. A hụrụ ọtụtụ ndị nsọ, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nʼọnwụ bilie. Mgbe ha sitere nʼọnwụ bilie, ha hapụrụ ili ha banye nʼime obodo nsọ, gosikwa ọtụtụ mmadụ onwe ha. Mgbe ọchịagha, na ndị ya ha nọ nʼebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe niile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”
MATIU 27:50-54 Bible Nso (IGBOB)
Ma Jisus were oké olu ti nkpu ọzọ, we ra mọ-Ya nye Chineke. Ma le, ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke b͕awara iberibe abua site n'elu rue ala; ala ma-kwa-ra jijiji; oké nkume b͕awa-kwa-ra; ílì meghe-kwa-ra; ewe me ka aru ọtutu ndi di nsọ ndi raruri ura si n'ọnwu bilie; ha we si n'ebe anēlì ozu puta mb͕e nbilite-n'ọnwu-Ya gasiri, we ba n'obodo nsọ, were onwe-ha gosi ọtutu madu. Ma ọchi-agha nāchi ọgu ndi-agha ise, na ndi ha na ya nọ nēche Jisus, mb͕e ha huru ala-ọma-jijiji ahu, na ihe nile emere, ha tua egwu ri nne, si, N'ezie Nwoke a bu Ọkpara Chineke.