Mafee gaa na ọdịnaya

MATIU 27:3-4 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MATIU 27:3-4 IGBOB (Bible Nso)

Mb͕e ahu Judas, onye rara Ya nye, mb͕e ọ huru na amara Ya ikpé, ọ kwa uta, chighachi orú ego ọla-ọcha na iri ahu nye ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye, si, Emehierem n'irara ọbara Onye ikpé nāmaghi nye. Ma ha siri, Òle nke diri ayi nime ya? gi onwe-gi le nke ahu.

MATIU 27 IGBOB

MATIU 27:3-4 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, hụrụ na a maala Jisọs ikpe ọnwụ, o chegharịrị weghachikwara ndịisi nchụaja na ndị okenye iri ego ọlaọcha atọ ahụ. Ọ kwuru sị, “Emehiela m, site na ịrara onye aka ya dị ọcha nye ọnwụ.” Ma ha sịrị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ mkpa dịrị gị.”

MATIU 27 BIU