MATIU 26:51-54
MATIU 26:51-54 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Otu onye nʼime ndị ha na Jisọs nọ, setịrị aka ya, mịpụta mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya. Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya, nʼihi na mmadụ ọbụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya ga-anwụ site na mma. I cheghị na m pụrụ ịrịọ Nna m ka o zitere m ihe karịrị usuu ndị mmụọ ozi iri na abụọ nʼotu ntabi anya? Ma olee otu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-esi mezuo, nke kwuru na ọ ghaghị ịdị otu a?”
MATIU 26:51-54 Bible Nso (IGBOB)
Ma le, otù onye nime ndi ha na Jisus nọ setiri aka-ya, miputa mma-agha-ya, b͕u orù onye-isi-nchu-aja mma, bipu nti-ya. Mb͕e ahu Jisus si ya, Mighachi mma-agha-gi n'ọnọdu-ya: n'ihi na madu nile ndi were mma-agha gāla n'iyì site na mma-agha. Ma-ọbu i nēchè na apughm iriọ Nnam, Ọ gēzite-kwa-ram ọbuná ub͕u a kari legion iri na abua nime ndi-mọ-ozi? Ihe edeworo n'akwukwọ nsọ gēsi kwa aṅa mezu, na ọ ghaghi ime otú a?