MATIU 25:6-10
MATIU 25:6-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“Nʼetiti abalị e tiri mkpu nʼoke olu sị, ‘Onye na-alụ nwunye ọhụrụ na-abịa, pụtanụ gaa zute ya!’ “Mgbe ahụ ụmụ agbọghọ niile ahụ biliri mụnye oriọna ha. Ise ndị nzuzu ahụ rịọrọ ise ndị maara ihe sị, ‘Biko, wụnyetụrụnụ anyị ụfọdụ nʼime mmanụ ọkụ unu, lee na oriọna anyị na-anyụ anyụ.’ “Ndị maara ihe zara ha sị, ‘Mba! Ọ gaghị ezuru anyị na unu. Kama gaanụ zuru nke unu nʼaka ndị na-ere ya.’ “Ma mgbe ha pụrụ ịzụta mmanụ ọkụ ahụ, onye na-alụ nwunye ọhụrụ bịarutere. Ndị jikeere ejikere soro ya banye nʼoriri ọlụlụ di na nwunye ahụ. E mechikwara ọnụ ụzọ.
MATIU 25:6-10 Bible Nso (IGBOB)
Ma n'etiti abali iti-nkpu dara, Le, onye nālu nwunye ọhu! Putanu izute ya. Mb͕e ahu umu-ab͕ọghọ ahu nile biliri, we dozie ọwa-ha. Ndi-nzuzu we si ndi nwere uche, Nye ayi ufọdu na manu-unu; n'ihi na ọwa-ayi nānyu anyu. Ma ndi nwere uche zara, si, É-è, eleghi anya ọ gaghi-ezuru ayi na unu: kama jekurunu ndi nēre, zuru nye onwe-unu. Ma mb͕e ha nēje izú, onye nālu nwunye ọhu biara; ndi edoziworo we so ya ba n'oriri ọlulu-nwunye: ewe mechie uzọ.