MATIU 25:1-5
MATIU 25:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere oriọna ha pụta izute onye na-alụ nwunye ọhụrụ. Ise nʼime ha maara ihe, ma ise ndị ọzọ bụ ndị nzuzu. Ise ndị nzuzu ahụ weere oriọna ha, ma ha ejighị mmanụ ọkụ. Ise ndị maara ihe, wụjuru mmanụ ọkụ na karama, tinyekwa oriọna ha. Mgbe onye na-alụ nwunye ọhụrụ ahụ nọrọ ọdụ nʼọbịbịa ya, ụra tụwara ha, ha dinara ala rahụ ụra.
Kesaa
Gụọ MATIU 25MATIU 25:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu agēji ala-eze elu-igwe tuyere umu-ab͕ọghọ iri, ndi chiri ọwa-ha, pua izute onye nālu nwunye ọhu. Ma ise nime ha bu ndi-nzuzu, ise bu kwa ndi nwere uche. N'ihi na ndi-nzuzu ahu, mb͕e ha chiri ọwa-ha, ha ejighi manu n'aka-ha: ma ndi ahu nwere uche ji manu n'aria-ha tiyere ọwa-ha. Ma mb͕e onye nālu nwunye ọhu nānọ ọdù di anya, ha nile rubere ura we raru.
Kesaa
Gụọ MATIU 25