Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

MATIU 24:45-47 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile

MATIU 24:45-47 IGBOB (Bible Nso)

Ònye kwa bu orù ahu kwesiri ka atukwasi ya obi, nke nwe-kwa-ra uche, nke onye-nwe-ya mere onye-isi èzí-na-ulo-ya, inye ha ihe eji azù ha n'oge-ya? Ngọzi nādiri orù ahu, onye, mb͕e onye-nwe-ya gābia, ọ gāhu ya ka ọ nēme otú a. N'ezie asim unu, na ọ gēme ya onye-isi ihe nile o nwere.

MATIU 24:45-47 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)

“Onye bụ ohu ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi ma nwekwa uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ndị ohu nọ nʼezinaụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri nʼoge ya? Ngọzị na-adịrị ohu ahụ, onye, mgbe onyenwe ya ga-alọghachi hụ na ọ na-eme otu a. Nʼezie asị m unu, ọ ga-eme ya onyeisi nke ihe niile o nwere.