MATIU 24:10-13
MATIU 24:10-13 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọtụtụ ga-ada site nʼokwukwe ha nʼoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha ma nʼọnya, kpọọkwa ibe ha asị. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ. Nʼihi na ajọ omume bara ụba nʼebe niile, ịhụnanya ọtụtụ ndị mmadụ nʼebe ibe ha nọ ga-ajụ oyi. Ma onye ga-eguzosi ike ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.
Kesaa
Gụọ MATIU 24MATIU 24:10-13 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e ahu ka ọtutu madu gāma kwa n'ọnyà, rara kwa ibe-ha nye, kpọ kwa ibe-ha asì. Ọtutu ndi-amuma ugha gēbili kwa, duhie kwa ọtutu madu. N'ihi na ihe nēmebi iwu gāba uba, ihu-n'anya nke ndi ka n'etiti madu gāju kwa oyi. Ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa.
Kesaa
Gụọ MATIU 24