MATIU 24:1-8
MATIU 24:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Jisọs si nʼụlọnsọ ahụ na-apụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya na-achọ igosi ya akụkụ dị iche iche nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ma ọ zara ha sị, “Unu hụrụ ihe ndị a niile? Nʼezie agwa m unu, oge na-abịa mgbe ọ bụladị otu nkume na-agaghị adịgidekwa nʼelu ibe ya, nke a na-agaghị akwatu nʼala.” Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?” Jisọs zara ha sị, “Lezienụ anya ka onye ọbụla ghara iduhie unu ụzọ. Nʼihi na ọtụtụ ga-abịa nʼaha m, na-ekwu sị, ‘Abụ m Kraịst ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ụzọ. Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nʼihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha anaghị egosi na ọgwụgwụ oge eruola. Mba ga-ebili megide mba ibe ya, alaeze ga-ebilikwa megide alaeze ọzọ; oke ụnwụ, na ala ọma jijiji ga-adịkwa nʼọtụtụ ebe dị iche iche. Ma ihe ndị a niile bụ naanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa.
MATIU 24:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Jisus we si n'ulo uku Chineke pua, we nāga n'uzọ-Ya; ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya igosi Ya owuwu-ulo nile nke ulo uku Chineke. Ma Ọ zara, si ha, Ùnu ahughi ihe ndia nile? n'ezie asim unu, Agaghi-arapu otù nkume ma-ọli n'ebe a n'elu nkume-ibe-ya, nke anāgaghi-akwatu n'ala. Mb͕e Ọ nānọdu n'elu ugwu Olive, ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya iche, si, Gwa ayi, òle mb͕e ihe ndia gābu? gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a? Jisus we za, si ha, Lezienu anya ka onye ọ bula ghara iduhie unu. N'ihi na ọtutu madu gābia n'aham, si, Mu onwem bu Kraist ahu; ha gēduhie kwa ọtutu madu. Unu gāje inu okwu agha di iche iche na akukọ agha di iche iche: lenu ka unu ghara itu ujọ: n'ihi na ihe ndia aghaghi iputa; ma ọgwugwu ihe nile akērughi. N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: oké unwu na ala-ọma-jijiji gādi kwa n'ebe di iche iche. Ma ihe ndia nile bu nmalite ihe-nb͕u.