MATIU 23:34 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 23:34 IGBOB (Bible Nso)
N'ihi nka, le, Mu onwem nēzitere unu ndi-amuma, na ndi-amam-ihe, na ndi-ode-akwukwọ: ufọdu nime ha ka unu gēb͕u, kpọgide kwa ha n'obe; ufọdu nime ha ka unu gāpia kwa ihe n'ulo-nzukọ-unu, si kwa n'otù obodo nēsob͕u ha ga obodo ọzọ
Kekọrịta
MATIU 23 IGBOBMATIU 23:34 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, aga m ezitere unu ndị amụma, ndị amamihe na ndị nkuzi. Ụfọdụ nʼime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nʼobe, ndị ọzọkwa ka unu ga-apịa ihe nʼụlọ nzukọ unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nʼotu obodo gaa nʼobodo ọzọ.
Kekọrịta
MATIU 23 BIU