MATIU 21:23-46
MATIU 21:23-46 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Mgbe Jisọs batara nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu bịakwutere ya ka ọ nọ na-akụzi ihe jụọ ya sị, “Olee ikike i ji na-eme ihe ndị a niile? Ọ bụ onye nyekwara gị ikike a?” Jisọs zara sị ha, “Aga m ajụkwa unu otu ajụjụ. Ọ bụrụ na unu azaa ya, aga m agwakwa unu onye nyere m ikike m ji eme ihe ndị a niile. Baptizim nke Jọn o sitere nʼeluigwe, ka ọ si nʼaka mmadụ?” Ha kparịtara ụka nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o si nʼeluigwe,’ ọ ga-asị anyị, ‘Ọ bụ gịnị mere unu na-ejighị kwenye na ya?’ Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘Na o sitere nʼaka mmadụ,’ anyị na-atụ igwe mmadụ ndị a egwu, nʼihi na mmadụ niile kwenyere na Jọn bụ onye amụma.” Ya mere ha zara Jisọs sị ya: “Anyị amaghị.” Jisọs zakwara ha sị, “Mụ onwe m agaghị agwakwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a. “Gịnị ka unu chere banyere ihe a? Otu nwoke nwere ụmụ nwoke abụọ gwara nwa ya nke okenye sị ya, ‘Nwa m nwoke, gaa rụọ ọrụ nʼubi vaịnị m taa.’ “Ọ zara ya sị, ‘Agaghị m aga.’ Ma o mesịrị gbanwee obi ya gaakwa rụọ ọrụ ahụ. “Nna ha bịakwutere nwa ya nke nta gwakwa ya otu ihe ahụ. Nwa ahụ zakwara sị, ‘Aga m aga, onyenwe anyị.’ Ma nʼikpeazụ ọ gaghị. “Onye nʼime ha abụọ mere ihe nna ya chọrọ?” Ha zara sị ya, “Onye nke mbụ.” Jisọs kọwaara ha sị, “Nʼezie agwa m unu, ndị ọna ụtụ na ụmụ nwanyị akwụna ga-ebu unu ụzọ banye nʼalaeze Chineke. Nʼihi na Jọn bịakwutere unu igosi unu ụzọ ezi omume, ma unu ekweghị. Ndị ọna ụtụ, na ụmụ nwanyị akwụna chegharịrị. Ọ bụladị mgbe unu hụrụ nke a, o mekwaghị ka unu chegharịa kwere na ya. “Ugbu a geekwanụ ntị nʼilu ọzọ. Otu onye dị nke nwere ala ubi. Ọ kụrụ osisi vaịnị nʼubi a. Ọ gbakwara ubi ya ogige, gwuokwa ebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị nʼime ya. O wukwara ụlọ elu nʼime ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o weere ubi ahụ tinye nʼaka ndị ga-elekọtara ya ubi ahụ, pụọ gaa nʼala ọzọ. Mgbe oge iwe ihe ubi ruru, o zipụrụ ndị odibo ya ka ha jekwuru ndị na-elekọta ubi ahụ, nata mkpụrụ nke ruuru ya site nʼubi ahụ. “Ma ndị na-elekọta ubi ahụ jidere ndị odibo ya ahụ tie otu onye nʼime ha ihe, gbukwaa onye ọzọ nʼime ha. Ha tụkwara otu nʼime ha nkume. Emesịa, o zigakwara ọtụtụ ndị odibo karịrị ndị nke mbụ nʼọnụọgụgụ. Ma ndị na-elekọta ubi ahụ mekwara ndị a ihe ha mere ndị nke mbụ. Nʼikpeazụ o zigara ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-asọpụrụ nwa m.’ “Ma mgbe ndị na-elekọta ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gbara izu nʼetiti onwe ha sị, ‘Lee! Onye a bụ onye nketa ihe niile. Bịanụ ka anyị gbuo ya, ma nwetakwa ihe nketa ya.’ Ya mere, ha jidere ya nʼike, kpụrụ ya gafee nʼazụ ubi vaịnị ahụ, gbuo ya nʼebe ahụ. “Mgbe onye nwe ubi vaịnị ahụ lọtara, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme ndị ahụ o tinyere ilekọtara ya ubi ya?” Ha zara ya sị, “Ọ ga-egbu ndị ajọ omume ahụ, laa ha nʼiyi nʼụzọ dị njọ. Ọ ga-ewerekwa ubi vaịnị ya tinye nʼaka ndị nlekọta ọzọ, ndị ga-enyekwa ya mkpụrụ ubi ruuru ya nʼoge ya.” Jisọs sịrị ha, “Ọ ga-abụ na unu agụtabeghị ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, abụrụla nkume isi ntọala ụlọ. Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị rụrụ, ọ bụkwa ọrụ ịtụnanya nʼanya anyị.’ “Ya mere, ana m eme ka unu ghọta, na a ga-anapụ unu alaeze Chineke, were ya nye ndị mba ọzọ, ndị ga-amịpụta ezi mkpụrụ. Onye ọbụla nke dakwasịrị nʼelu nkume a ga-etiwasị, ma ọ ga-egwepịa onye ọbụla nke ọ dakwasịrị.” Mgbe ndịisi nchụaja na ndị Farisii nụrụ ilu ya ndị a, ha ghọtara na ọ na-ekwu banyere ha. Ha chọrọ ụzọ ha ga-esi jide ya, ma oke egwu igwe mmadụ ahụ tụrụ ha, nʼihi na ha gụrụ ya nʼonye amụma.
MATIU 21:23-46 Bible Nso (IGBOB)
Mb͕e Ọ batara n'ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-okenye nke ndi-Ju we biakute Ya mb͕e O nēzí ihe, si, Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ònye nye-kwa-ra Gi ike a? Ma Jisus zara, si ha, Mu onwem gāju kwa unu otù okwu, ọ buru na unu agwam ya, Mu onwem gāgwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia. Baptism nke Jọn, òle ebe o si puta? ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na o sitere n'aka madu? Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gāsi ayi, N'ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya? Ma ọ buru na ayi asi, O sitere n'aka madu; ayi nātu egwu ìgwè madu a; n'ihi na madu nile nāgu Jọn dika onye-amuma. Ha we za Jisus, si, Ayi amataghi. Ọ si-kwa-ra ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia. Ma gini bu uche-unu? Otù nwoke nwere umu abua; o we biakute nke-mbu, si, Nwa, je lua ọlu ta n'ubi-vine nkem. Ma ọ zara, si, Achọghm ije: ma emesia ọ kwa uta, we je. O we biakute nke-abua, kwue otú ahu. O we za, si, Mu onwem gēje, Onye-nwe-ayi: ma o jeghi. Ònye nime ha abua mere ihe nna-ya chọrọ? Ha si, Onye mbu. Jisus si ha, N'ezie asim unu, na ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko nēbu unu uzọ abà n'ala-eze Chineke. N'ihi na Jọn biakutere unu n'uzọ ezi omume, ma unu ekweghi ya: ma ndi-ọna-utu na ndinyom nke nākwa iko kwere ya: ma mb͕e unu huru ya, unu onwe-unu akwaghi uta ọbuná emesia, ka unu we kwere ya. Nurunu ilu ọzọ: Otù nwoke di, bú nna-nwe-ulo, onye kuru ubi-vine, b͕a ya ogige buruburu, gwu kwa ebe-nzọcha-nkpuru-vine nime ya, wu kwa ulo-elu, were kwa ya tiyere n'aka ndi-ọlu-ubi, we je ala ọzọ. Ma mb͕e oge nkpuru ruru nso, o zigara ndi-orù-ya jekuru ndi-ọlu-ubi ahu, inata nkpuru-ya. Ndi-ọlu-ubi ahu we jide ndi-orù-ya, pia otù onye ihe, b͕u kwa nke-ọzọ, tu kwa nke-ọzọ nkume. Ọzọ, o zigara ndi-orù ọzọ di ọtutu kari ndi mbu: ha we me kwa ha otú ahu. Ma emesia o zigara ha ọkpara-ya, si, Ha gāsọpuru ọkparam. Ma ndi-ọlu-ubi ahu, mb͕e ha huru ọkpara ahu, ha sirita onwe-ha, Nka bu onye-nketa; bianu, ka ayi b͕ue ya, nwere kwa ihe-nketa-ya. Ha we jide ya, tupu ya n'azu ubi-vine ahu, b͕ue ya. Ya mere, mb͕e ọ bula onye-nwe ubi-vine ahu gābia, gini ka ọ gēme ndi-ọlu-ubi ahu? Ha si ya, Ọ gāla ndi ọjọ ahu n'iyì n'uzọ jọrọ njọ, ọ gēwere kwa ubi-vine-ya tiye n'aka ndi-ọlu-ubi ọzọ, ndi gēnyeghachi ya nkpuru-ya n'oge-ha. Jisus si ha, Ọ̀ dighi mb͕e ọ bula unu guru n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, Nkume nke ndi nēwu ulo juru, Nke ahu ka emere isi nkuku ulo: Ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka nka sitere, Ọ bu kwa oké ọlu n'anya-ayi? N'ihi nka ka M'ji si unu, Agānara unu ala-eze Chineke, we nye mba ọzọ nke nāmi nkpuru-ya. Agētiwasi kwa onye dakwasiri nkume a: ma onye ọ bula ọ gādakwasi, ọ gēfesa ya dika ájá. Mb͕e ndi-isi-nchu-aja na ndi-Farisi nuru ilu-Ya nile, ha we mara na Ọ nēkwu okwu bayere ha. Mb͕e ha nāchọ ijide Ya, ha we tua egwu ìgwè madu nile, ebe ha guru Ya n'onye-amuma.