MATIU 2:5-6 - Lee Anya N'etiti Ụdị Nsụgharị Niile
MATIU 2:5-6 IGBOB (Bible Nso)
Ha we si ya, Na Betlehem nke Judia: n'ihi na otú a ka edeworo ya n'akwukwọ site n'aka onye-amuma, si, Gi Betlehem kwa, ala Juda, I dighi nke-ntà kachasia n'etiti ndi-isi Juda ma-ọli: N'ihi na n'etiti gi ka Onye-isi gāputa, Onye gāzù ndi nkem Israel dika aturu.
Kekọrịta
MATIU 2 IGBOBMATIU 2:5-6 BIU (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ha zara ya sị, “Na Betlehem nke Judịa. Nʼihi na otu a ka onye amụma ahụ dere nʼakwụkwọ sị, “ ‘Ma gị onwe gị, Betlehem, dị nʼala Juda, ị dịghị nta karịchasịa nʼetiti ndị ọchịchị Juda, nʼihi na ọ bụ site na gị ka onye ọchịchị ga-esi pụta, onye ga-achị ndị nke m Izrel.’”
Kekọrịta
MATIU 2 BIU